Atilogwu Dance: Etu egwu Atlogwu siri nweta aha ya
Atilogwu Dance: Etu egwu Atịịlogwu siri nweta aha ya
15 Mee 2022
Otu egwu Atiilogwu bụ egwu e jiri mara ndị Igbo.
Ya bụ egwu agaala mba niile n'ala Naịjiria nakwa mba ofesi n'aha ndị Igbo.
Egwu Atilogwu so n'egwu bụ ọkaibe n'emume 'Festical of Arts and Culture' (Festac) nke e mere na Naịjirịa n'afọ 1977.
Ihe ịtụnanya bụ na ya bụ egwu abụghị egwu ọdịnaala, kama ọ bụ egwụ ndị Udi na Ezeagu bi na Legọs malitere kemgbe afọ 1947.
Akụkọ kọrọ na obodo abụọ a dị na Enugwu steeti mụrụ ya bụ egwu n'ebe dị icheiche nke gụnyere Awka, n'Anambara steeti n'afọ 1942.
Ha gwara ya bụ egwụ ọgwa tinye ya egwu ọdịnaala ndị ọzọ dịka Ogwurogwu, Ugwuọyakanga, Ọganigwe, na Odegere bụ nke mere ka ọ bụrụ ọpụrụiche dị n'egwu.
Nke a mere ka ndị mmadụ jụo ka "etinyere ya ọgwụ" bụ naara ya aha ruo taa.
Akụkọ ọzọ gbasara ebe ya bụ egwu si bịa bụ na otu Dinta nụrụ ka a na-agba ya bụ egwụ n'ọhịa were mụta ya kuziere ndị mmadụ.
BBC amaghị ka nke a ọ bụ eziokwu ka ọ bụ ugha, mana ihe doro anya bụ na otu e si agba ya bụ egwu tụrụ ndị mmadụ n'anya nke ukwuu bụ ihe mere e jiri gụọ ya "Atiilogwu" n'asụsụ ndị Ezeagu.
N'akụkọ nke mbụ, ka ndị obodo abụọ a mụtara ya bụ egwu mechere gbasaa, ndị Ezeagu bi na Lagọs jidesie nke ha ike mee ka ụmụ ha na ụmụụmụ ha mụkwaa ya bụ egwu.
Mgbe agha Naịjirịa na Biafra biri, ndị Ezeagu bi na Legọs dịka Sylvester Nwokeocha Nzekwe, Emmanuel Ume, Innocent Ozoeze, Peter Onyema, Christopher Onah na ndị ọzọ buru ya bụ egwu lọta Enugwu bụ be ha nọzị kuziwere ya ndị ọzọ.
Akadieze Ambrose bụ onyeisi ndị egwu a so na ndị mụtara ya n'aka ndị a akpọrọ aha ha ma na-etekwa ya ugbua.
Ọ kọwaara BBC ka ha siri malite nakwa ka ha sị akuziri ya ndị ọzọ, ihu na ya bụ ọkụ agaghị anyụnahụ ha n'aka.
Kirie ya ka ị ịhụ ka ha si eme ya.
ncG1vNJzZmivp6x7o67CZ5qopV%2BetKO7jpqdoqqZoK5ugpBtbG5xYGY%3D